﻿Diuteronomi.
19.
Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile, 
mgbe ahụ, kewapụta obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche. 
Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ. 
Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya. 
Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya. 
Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu. 
Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ. 
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa, 
nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ. 
Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa. 
Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a, 
ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya. 
Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma. 
Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta. 
Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe. 
Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha, 
a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ. 
Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha, 
ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị. 
Ndị niile nụrụ ya ga-atụ egwu, ha agaghị emekwa ihe ọjọọ dị otu ahụ ọzọ. 
Emekwala ebere ọbụla. Ndụ laara ndụ, anya laara anya, eze laara eze, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ. 
