﻿Job.
28.
Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị; ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa. 
E si nʼime ala ewepụta igwe, ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla. 
Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ; ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya, na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị. 
Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi, nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru, nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị. 
Ala ahụ e si na ya enweta nri, abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya. 
Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo. 
Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya. 
Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ. 
Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè. 
Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile. 
Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè. 
Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi? 
Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ. 
Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.” 
A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya, apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha. 
A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya, 
A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya. 
Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi. 
A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya. 
Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi? 
E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ, e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe. 
Mbibi na ọnwụ na-asị; “Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.” 
Chineke ghọtara ụzọ ya, naanị ya makwara ebe obibi ya dị. 
Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe. 
Mgbe o hiwere ike nke ikuku, tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ, 
mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku, 
mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya, meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya. 
Ọ sịrị mmadụ, “Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.” 
