﻿Abụ Ọma.
47.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. 
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile. 
O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị. 
Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela 
Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo. 
Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto. 
Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya. 
Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile. 
Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu. 
