﻿Abụ Ọma.
54.
Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m. 
O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m. 
Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela 
Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume. 
Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi. 
Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma. 
Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya. 
