﻿Abụ Ọma.
120.
Abụ nrigo. Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m. 
O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ. 
Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ? 
Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere. 
Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda! 
Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị. 
Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha. 
