﻿Ilu.
10.
Ilu dị iche iche nke Solomọn: Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ; ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ. 
Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru, ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ. 
Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ, ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma. 
Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba. 
Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere. 
Onye ezi omume na-anata ngọzị, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 
Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị, ma aha onye ajọ omume ga-ere ure. 
Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu, ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi. 
Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu, ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta. 
Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute, onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi. 
Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 
Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile. 
Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi, ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu. 
Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma, ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku. 
Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye. 
Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ, ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ. 
Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ, ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo. 
Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu. 
Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha. 
Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma, ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta. 
Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ, ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha. 
Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu. 
Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ; ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta. 
Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya, ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya. 
Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi. 
Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya; ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze. 
Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ, ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ. 
Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ; olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu. 
Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta, maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe. 
A pụghị iwezuga onye ezi omume, ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide. 
Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu. 
Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie. 
