﻿Izikiel.
15.
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 
“Nwa nke mmadụ, olee, ụzọ osisi vaịnị si pụọ iche site nʼalaka osisi ndị ọzọ dị nʼime oke ọhịa? 
A na-esi nʼime osisi ya were mepụta ihe ọbụla bara uru? Ọ bụ site na ya ka a na-esi emepụta osisi nke e ji ekonye ihe? 
Uru ha bara bụ iji ha menye ọkụ. Ma mgbe isi ya abụọ repịara, mgbe etiti ya rekwara ọkụ, o nwere ihe ọzọ mmadụ nwere ike iji ya mee? 
Ọ bụrụ na ọ baghị uru mgbe o zuruoke, a ga-esi aṅa were ya mepụta ihe bara uru mgbe ọkụ repịasịrịla ya, ọ ghọọ unyi? 
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, dịka m sitere nʼetiti ọhịa niile wepụta osisi vaịnị nye ka ọ bụrụ nkụ e ji emenye ọkụ, otu a ka m ga-esi mesoo ndị bi na Jerusalem. 
Aga m eche ihu m imegide ha. Ọ bụ ezie na ha esitela nʼọkụ pụta, ma ọkụ ga-erepịa ha. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m guzoro onwe m megide ha. 
Aga m emekwa ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, nʼihi na ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” 
