﻿2 Ndị Kọrint.
2.
Ekpebiri m nʼime obi m na-agaghị m abịakwute unu ọzọ, iwetara unu ihe mwute. 
Nʼihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ ga-akasị m obi ma ọ bụghị unu, unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ? 
E deere unu akwụkwọ a dịka m kwesiri ime ka m ghara inwe mwute mgbe m bịara, site nʼaka ndị kwesiri ime ka obi dị m mma, nʼihi na o doro m anya na ọṅụ m ga-abụ ọṅụ nke unu niile. 
Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ. 
Ọ bụrụ na onye ọbụla mere ihe butere obi mgbu, ka a hapụ ikwu ya karịa ka o kwesiri, ọ bụghị naanị m ka o wetaara obi mgbu, o wetakwaara unu niile obi mgbu. 
Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola. 
Ugbu a, bikonu ụmụnna m, o kwesiri ka unu gbaghara ya, ma kasịe ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu maọbụ daa mba na mmụọ ya, rubiga ụjụ oke. 
Ya mere ana m arịọ unu, bikonu, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nʼanya. 
Ihe mere m ji dee ihe m dere nʼakwụkwọ nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe niile irube isi nʼihe niile. 
Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ahụ mụ onwe m kwa agbagharala ya. Mgbaghara m, a sịkwa na o nwere ihe m na-agbaghara, ana m eme ya nʼihi unu nʼihu Kraịst. 
Anyị na-eme nke a ka Ekwensu ghara ịghọgbu anyị. Anyị maara ihe niile ọ na-ezube. 
Mgbe m bịarutere Troas ikwusa oziọma Kraịst, e megheere m ụzọ nʼime Onyenwe anyị. 
Ma enweghị m izuike nʼime obi m, nʼihi na ahụghị m Taịtọs ezi nwanna m nʼebe ahụ. Nke a mere m jiri kelee ha hapụ ha gawa Masidonia. 
Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya. 
Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi. 
Nʼetiti ndị ahụ na-ala nʼiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nʼetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Onye zuru ime ihe ndị a? 
Nʼihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahịa. Kama, nʼime Kraịst anyị na-ekwu okwu anyị site nʼobi dị ọcha, dịka ndị ahụ Chineke zipụrụ ịrụ ọrụ a. 
